Jeremiah 50

Ozi e ziri banyere Babilọn

1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.

2“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya;
bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya.
Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị,
‘A ga-adọta Babilọn nʼagha.
Ihere ga-emesịa mee Bel;
otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi.
A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ;
oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’
3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha,
mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya,
nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.

4“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu.
Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.
5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn.
Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ.
Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee
Rapara nʼahụ Onyenwe anyị
nʼaka Onyenwe anyị,
nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi,
nke a na-agaghị echefu echefu.

6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu.
Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha,
mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile.
Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta.
Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha.
Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị
nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha,
na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’

8“Sinụ na Babilọn gbalaga;
sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ,
dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ.
9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,
ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha.
Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya;
ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha.
Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba.
Ha agaghị agba aka lọta.
10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.
Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
gị onye bibiri ihe nketa m,
ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,
bee akwa dịka oke ịnyịnya.
12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.

14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
unu ndị niile na-agba ụta.
Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ
nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.
15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,
a kwatuokwala mgbidi ya niile.
Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,
bọọnụ ya ọbọ.
Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.
16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.
Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,
ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,
nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.

17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
nke ọdụm chụsasịrị.
Onye bu ụzọ ripịa ya
bụ eze Asịrịa.
Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya
bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”
18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,

“Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ,
dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.
19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.
Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead
ka afọ ga-ejukwa ha.
20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel,
ma ọ dịghị nke a ga-achọta.
A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda,
ma o nweghị nke a ga-achọta,
nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.

21“Busonụ ala Merataim agha,
busokwanụ ndị bi na Pekod agha.
Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ,
a na-anụ ụzụ oke mbibi.
23Lee ka e si gbajie,
ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile.
Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile nke ụwa.
24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn;
ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị.
A chọtala gị, jidekwa gị,
nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.
25 Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya,
site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn.
26Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha.
Kụkapunụ ọba ya niile,
tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha.
Bibienụ ya kpamkpam,
ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.
27Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile,
ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ
Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala,
bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ.
28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ.
Ha na-ekwusa na Zayọn
otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ,
otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.

29“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn,
bụ ndị niile na-agba ụta.
Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu;
unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ.
Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ.
Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị,
bụ Onye nsọ nke Izrel.
30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile.
A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Nʼihi na ụbọchị gị abịala,
bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ.
32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,
ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa.
Aga m esunye obodo ya niile ọkụ,
nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”
33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:

“A na-emegbu nnọọ ndị Izrel,
nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda.
Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike.
Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.
34Ma Onye mgbapụta ha dị ike.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya.
Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha,
ime ka ala ha nweekwa izuike,
ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.

35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“na ndị ahụ niile bi na Babilọn
ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.
36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile.
Ha ga-aghọ ndị nzuzu.
Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha.
Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.
37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,
na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha.
Ha ga-aghọkwa ndị inyom.
Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile.
A ga-alụta ha niile nʼagha.
38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile
mee ka ha taa.
Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị:
arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.

39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ.
O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze
ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Babilọn.
43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu ejidela ya,
ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.
44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ,
nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn,
nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ.
Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
46Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn,
iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.
Copyright information for IboBIU